4 Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n'elu ugwu nke Ararat n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu.
5 Miri we nēbilata mb͕e nile rue ọnwa nke-iri: n'ọnwa nke-iri ahu, n'ubọchi mbu nke ọnwa, ka ahuru elu ugwu.
6 O rue, mb͕e ọgu ubọchi abua gwusiri, na Noa meghere window nke ub͕ọ o mere:
7 o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa.
8 Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba;
9 ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.
10 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ;