7 o zipu ugolo ọma, nke púru nāpù nālata, rue mb͕e miri tasiri n'elu uwa.
8 Ọ we si n'ebe ọ nọ zipu nduru, ile ma miri esiwo n'elu ala taba;
9 ma nduru ahu ahughi ebe-izu-ike nye ọbu-ukwu-ya, ọ we laghachikute ya rue n'ub͕ọ, n'ihi na miri ahu di n'elu uwa nile: ọ we setipu aka-ya, were ya, me ka ọ bakute ya nime ub͕ọ.
10 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ; ọ we si n'ub͕ọ zipu nduru ahu ọzọ;
11 nduru ahu we bakute ya na mb͕e anyasi; ma, le, akwukwọ osisi olive akubitere ọhu di n'ọnu-ya: Noa we mara na miri esiwo n'elu uwa taba.
12 Ọ we che kwa ubọchi asa ọzọ, zipu nduru ahu; ma ọ laghachikuteghi ya ọzọ ma-ọli.
13 O rue, n'arọ nke-nnù na ọgu iri na otù, n'ọnwa mbu, n'ubọchi mbu nke ọnwa ahu, na miri siri n'elu uwa tasia: Noa we wezuga ihe-nkpuchi nke ub͕ọ ahu, hu, ma, le, iru ala kpọrọ nku.