16 na ndi Jebus, na ndi-Amorait, na ndi-Giagashait;
17 na ndi-Haivait, na ndi Aka, na ndi Sin;
18 na ndi Avad, na ndi Zemar, na ndi Hemat: emesia ab͕uru nile nke ndi Kenean we b͕asa.
19 Ókè-ala nke ndi Kenean we buru site na Zaidon, mb͕e i nēje Gera, rue Geza: mb͕e i nēje Sọdọm na Gọmọra na Adma na Zeboim, rue Lesha.
20 Ndia bu umu-ndikom Ham, dika ab͕uru nile ha si di, dika asusu nile ha si di, n'ala nile ha, nime mba nile ha.
21 Shem kwa, amukwara umu nye ya onwe-ya, ọ bu nna umu nile nke Iba, nwa-nne nke-okenye nke Jefet.
22 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.