2 Umu-ndikom Jefet; Goma, na Megog, na Madai, na Jevan, na Tubal, na Meshek, na Tiras.
3 Umu-ndikom Goma kwa; Ashkenaz, na Rifat, na Togama.
4 Umu-ndikom Jevan kwa; Elaisha, na Tashish, na Kitim, na Dodanim.
5 Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
6 Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.
7 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.
8 Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa.