22 Umu-ndikom Shem; Ilam, na Ashua, na Apakshad, na Lud, na Eram.
23 Umu-ndikom Eram kwa; Uz, na Hul, na Geta, na Mash.
24 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.
25 Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.
26 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;
27 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;
28 na Obal, na Abimael, na Sheba;