24 Apakshad muru Shela; Shela muru Iba.
25 Amuru umu-ndikom abua nye Iba: aha otù nime ha bu Peleg; n'ihi na ọ bu n'ubọchi-ya ka ekewara uwa; aha nwa-nne-ya nwoke bu Jọktan.
26 Jọktan muru Almodad, na Shelef, na Hazamavet, na Jera;
27 na Hadoram, na Uzal, na Dikla;
28 na Obal, na Abimael, na Sheba;
29 na Ofia, na Havila, na Jobab: ndia nile bu umu-ndikom Jọktan.
30 Ebe-obibi-ha we buru site na Misha, mb͕e i nēje Sefa, ugwu nke Iru-anyanwu.