5 Site na ndia ka ekesara ala nile di oké osimiri buruburu nke mba nile, n'ala nile ha, onye ọ bula dika asusu-ya si di; dika ab͕uru-ha nile si di, nime mba nile ha.
6 Umu-ndikom Ham kwa; Kush, na Mizraim, na Put, na Kenean.
7 Umu-ndikom Kush kwa; Seba, na Havila, na Sabta, na Reama, na Sabteka: umu-ndikom Reama kwa; Sheba, na Dedan.
8 Kush muru Nimrod; onye ahu malitere ibu dike n'uwa.
9 Ya onwe-ya bu dike n'ichu-ntá n'iru Jehova: n'ihi nka ka anāsi, Dika Nimrod, bú dike n'ichu-ntá n'iru Jehova.
10 Nmalite ala-eze-ya bu Bebel, na Erek, na Akad, na Kalne, n'ala Shaina.
11 O siri n'ala ahu pua je Asiria, wue Nineve, na Rehobot-Ia, na Kala,