6 na ndi Hoa n'ugwu-ha, bú Sia, rue El-peran, nke di n'akuku ọzara.
7 Ha we chigharia, bia En-mishpat (nke ahu bu Kedesh), tib͕ue ndi bi n'ọhia nile nke ndi Amalek, tib͕u kwa ndi-Amorait, ndi bi na Hazazon-tema.
8 Eze Sọdọm na eze Gọmọra na eze Adma na eze Zeboyim na eze Bila (nke ahu bu Zoa) we pua, do agha n'usoro imegide ha nime ndagwurugwu Sidim;
9 imegide Kedoalaoma, bú eze Ilam, na Taidal, bú eze Goyim, na Amrafel, bú eze Shaina, na Ariok, bú eze Elasa; eze anọ megide eze ise ahu.
10 Ma ndagwurugwu Sidim bu nání olùlù olùlù nke bitumen; ndi-eze Sọdọm na Gọmọra we b͕alaga, da n'ebe ahu, ndi fọduru we b͕alaga n'ugwu.
11 Ha we chiri àkù nile nke Sọdọm na Gọmọra, na ihe-oriri-ha nile, la.
12 Ha chiri kwa Lot na àkù-ya la, bú nwa nwa-nne Abram, n'ihi na ya onwe-ya bi na Sọdọm.