12 O rue, mb͕e anyanwu gaje ida, na oké ura dakwasiri Abram; ma, le, oké ujọ, bú ọchichiri uku, nādakwasi ya.
13 Ọ si Abram, Mara nke-ọma na nkpuru-gi gābu ọbìa n'ala nābughi nke ha, ha gēfè kwa ha; ha gēweda ha ala nnù arọ;
14 ọzọ kwa, mba ahu nke ha gēfè ka M'ganēkpe ikpe: emesia ha gāchiri àkù uku puta.
15 Ma gi onwe-gi gālakuru nna-gi-hà n'udo; agēlì gi n'ezi isi-awọ.
16 Ma n'ọb͕ọ nke-anọ ka ha gālata n'ebe a: n'ihi na ajọ omume ndi-Amorait akēzughi.
17 O rue na, mb͕e anyanwu dasiri, mb͕e ọ b͕a-kwa-ra ọchichiri, le, ite-ọku nke nākwu anwuru, na ọwa nke nēnwu ọku nke gabigara n'etiti iberibe anu ahu.
18 N'ubọchi ahu ka Jehova b͕ara ọb͕ub͕a-ndu nye Abram, si, Nkpuru-gi ka M'nyeworo ala nka, site n'osimiri Ijipt rue osimiri uku ahu, bú osimiri Yufretis: