14 Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.
15 Sera we gọ, si, Achighm ọchì; n'ihi na ọ nātu egwù. Ọ si, É-è; kama i chiri ọchì.
16 Ndikom ahu we si n'ebe ahu bilie, le anya n'ebe Sọdọm di: Abraham nēso kwa ha je idupu ha.
17 Jehova we si, Mu onwem, M'nēzonari Abraham ihe Mu onwem nēme;
18 ebe Abraham nāghaghi ighọ mba di uku nwe kwa ume, agāgọzi kwa mba nile nke uwa nime ya?
19 N'ihi na amawom ya, ka o we nye umu-ya na ulo-ya, ndi gānọchi ya, iwu, ka ha we debe uzọ Jehova, ime ezi omume na ihe ekpere n'ikpe; ka Jehova we weta n'isi Abraham ihe O kwuru bayere ya.
20 Jehova we si, Iti-nkpu Sọdọm na Gọmọra, o riri nne n'ezie, nmehie-ha kwa, ọ di arọ́ nke-uku n'ezie;