22 ọgiriga ahu, bú nke O weputara n'aru madu ahu, Jehova, bú Chineke, we wue ya dika ulo ka ọ ghọ nwanyi, O me ka ọ biakute madu ahu.
23 Madu ahu we si, Ehe! nka bu nọ ọkpukpu si n'ọkpukpum puta, na anu-aru si n'anu-arum puta: nka ka agākpọ Nwayi, n'ihi na eweputara nka n'aru Nwoke.
24 N'ihi nka ka nwoke gārapu nna-ya na nne-ya, rapara n'aru nwunye-ya: ha ewe ghọ otù anu-aru.
25 Ha abua we buru ndi b͕a ọtọ, nwoke ahu na nwunye-ya, ma ihere adighi-eme ha.