8 Nwa ahu we tó etó, eme ka ọ rapu ara: Abraham we me oké oriri di uku n'ubọchi emere ka Aisak rapu ara.
9 Sera we hu nwa-nwoke Hega, bú nwayi Ijipt, nke ọ mururi Abraham, ka ọ nāchì ọchì nke-uku.
10 Ọ we si Abraham, Chupu orù-nwayi a na nwa-ya nwoke: n'ihi na nwa-nwoke orù-nwayi a agaghi-eso nwam nwoke, bú Aisak, nweta ihe-gi.
11 Ma ihe ahu jọrọ njọ nke-uku n'anya Abraham n'ihi nwa-ya nwoke.
12 Chineke we si Abraham, Ka ọ ghara ijọ njọ n'anya-gi n'ihi nwa-okoro a, na n'ihi orù-gi nwayi: ihe nile Sera nāsi gi me, ge nti n'olu-ya; n'ihi na ọ bu nime Aisak ka agākpọrọ gi nkpuru.
13 Ọzọ kwa, nwa orù-nwayi ahu ka M'gēme ka ọ ghọ mba, n'ihi na nkpuru-gi ka ọ bu.
14 Abraham we bilie n'isi-ututu, were achicha na karama-akpukpọ miri nye Hega, tukwasi ya n'ubu-ya, ọ nye kwa ya nwa-ya, zilaga ya: ọ we je, nāwaghari n'ọzara Bia-sheba.