11 E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m'nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m'nye-woro ya; n'anya umu ndi nkem ka m'nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu.
12 Abraham we kpọ isi ala n'iru ndi ala ahu.
13 Ọ gwa Efron okwu na nti ndi ala ahu, si, Kama, ọ buru na gi onwe-gi kwere, biko, nuru olum: enyewom ego ọhia ahu; naram ya, ka m'we lìe onye-nkem nwuru anwu n'ebe ahu.
14 Efron we za Abraham, si ya,
15 Onye-nwem, nuru olum: ala nke ruru nnù shekel ọla-ọcha, ǹke ahu bu gini n'etiti mu na gi? lì kwa onye-nke-gi nwuru anwu.
16 Abraham we ge Efron nti; Abraham we tùara Efron ọla-ọcha ahu, nke o kwuru na nti umu Het, nnù shekel ọla-ọcha nke ndi-ahia gānara.
17 Ọhia Efron, nke di nime Makpila, nke di n'iru Mamre, ọhia ahu, na ọb͕à ahu nke di nime ya, na osisi nile nke di n'ọhia ahu, nke di n'ókè-ala ya nile gburugburu, ewe me ha ka ha guzosiere Abraham ike