5 Umu Het we za Abraham, si ya,
6 Nuru olu-ayi, onye-nwem: onye-isi nke Chineke ka i bu n'etiti ayi: lìe onye-nke-gi nwuru anwu n'ílì ahu nke kachasi nma n'ílì-ayi nile; ọ dighi onye nime ayi gēb͕ochiri gi ílì-ya ka i ghara ilì onye-nke-gi nwuru anwu
7 Abraham we bilie, kpọ isi ala nye ndi ala ahu, bú umu Het.
8 Ọ we kpayere ha uka, si, Ọ buru na ọ di na nkpuru-obi-unu ilìpu ya n'anyam, bú onye-nkem nwuru anwu, nurunu olum, riọkwara m Efron nwa Zoha,
9 ka ọ we nyem ọb͕à Makpila, nke ọ nwere, nke di n'isi nke ọhia-ya n'ego zuru ezu o ruru ka ọ gēnyem ya n'etiti unu ka ọ buru ihe-onwunwe, nke gābu ala-ílì.
10 Ma Efron nānọdu n'etiti umu Het: Efron onye Het we za Abraham na nti umu Het, bú ndi nile nābà n'ọnu-uzọ-ama obodo-ya, si,
11 E-è, onye-nwem, nuru olum: ọhia ahu ka m'nyeworo gi, na ọb͕à ahu nke di nime ya, gi ka m'nye-woro ya; n'anya umu ndi nkem ka m'nyeworo gi ya: lìe onye-nke-gi nwuru anwu.