35 Jehova agọziwo kwa onye-nwem nke-uku; o we di uku: O nyewo kwa ya ìgwè ewu na aturu na ìgwè ehi, na ọla-ọcha na ọla-edo, na orù-ndikom na ndinyom nēje ozi, na camel na inyinya-ibu di ọtutu.
36 Sera, bú nwunye nke onye-nwem, we muara onye-nwem nwa-nwoke mb͕e ọ ghọsiri agadi: o we nye ya ihe nile o nwere.
37 Onye-nwem we me ka m'ṅua iyi, si, I gaghi-alutara nwam nwunye sitere n'umu-ndinyom nke ndi Kenean, ndi mu onwem bi n'ala-ha:
38 kama ọ bu ulo nnam ka i gējekuru, jekuru ab͕urum, lutara nwam nwunye.
39 M'we si onye-nwem, Eleghi anya nwayi ahu agaghi-esom je.
40 Ọ sim, Jehova, Onye m'jeghariworo n'iru Ya, gēziga mọ-ozi-Ya ka gi na ya yikọ je, Ọ gēme kwa ka ije-gi ga nke-ọma; i gāluta-kwa-ra nwam nwunye sitere n'ab͕urum, na n'ulo nnam:
41 mb͕e ahu i gāpu n'iyi i ṅurum, mb͕e i gābiakute ab͕urum; ọ buru kwa na ha enyeghi gi ya, i gāpu kwa n'iyi i ṅurum.