9 Orù ahu we tiye aka-ya n'okpuru apata-ukwu Abraham onye-nwe-ya, ṅuara ya iyi bayere okwu a.
10 Orù ahu we chiri kamel iri, nime kamel nile nke onye-nwe-ya, je; ezi ihe nile nke onye-nwe-ya di kwa n'aka-ya: o bilie, je Mesọpọtemia, rue obodo Nehoa.
11 Ọ me ka camel nile b͕ue ikpere n'ala n'azu obodo ahu n'akuku olùlù-miri na mb͕e anyasi, na mb͕e ndinyom ndi nēsere miri nāputa.
12 Ọ si, Jehova, bú Chineke nke onye-nwem Abraham, biko, me ka o zutem taa, bú ihe m'nāchọ, mekwara onye-nwem Abraham ebere.
13 Le, mu onwem nēguzo n'akuku isi-iyi miri a; umu-ndinyom nke ndi obodo a nāputa kwa isere miri:
14 ka o ru kwa, na nwa-ab͕ọghọ ahu onye m'gāsi, Biko, zie ite-gi ka m'ṅua; onye gāsi kwa, Ṅua, ọzọ kwa, camel-gi ka m'gēme ka ha ṅua: ka ọ buru nwayi ahu ka I rọputaworo nye orù-gi, bú Aisak; ọ bu kwa nime nka ka m'gāmara na I meworo onye-nwem ebere.
15 O rue na, tutu o kwusia okwu, le, Rebeka nāputa, bú nwayi amuru nye Betuel nwa-nwoke Milka, bú nwunye Nehoa, nwa-nne Abraham, ite-ya di kwa n'ubu-ya.