10 bú ọhia nke Abraham zutara n'aka umu Het: n'ebe ahu ka elìri Abraham na Sera, bú nwunye-ya.
11 O rue, mb͕e ọnwu Abraham gasiri, na Chineke gọziri Aisak nwa-ya; Aisak we biri n'akuku Bia-lahai-roi.
12 Ndia bu osuso-ọmumu Ishmael, nwa Abraham, onye Hega, bú nwayi Ijipt, bú nwayi nējere Sera ozi, muru nye Abraham:
13 ndia bu kwa aha umu-ndikom Ishmael, n'aha-ha, dika osuso-ọmumu-ha si di: ọkpara Ishmael, Nebaiot; na Kida, na Adbeel, na Mibsam,
14 na Mishma, na Duma, na Masa;
15 na Hedad, na Tima, na Jetua, na Nafish, na Kidema:
16 ndia bu umu-ndikom Ishmael, ndia bu kwa aha-ha, n'obodo ntà nile ha, na n'ebe-ulo-ikwū nile ha; ndi-isi iri na abua dika mba nile ha si di.