23 O si n'ebe ahu rigorue Bia-sheba.
24 Jehova we me ka ọ hu Ya anya n'abali ahu, si, Mu onwem bu Chineke nke Abraham nna-gi: atula egwu, n'ihi na Mu na gi nọ, M'gāgọzi kwa gi, me ka nkpuru-gi ba uba n'ihi Abraham, bú orùm.
25 Ọ we wue ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, kpọkue aha Jehova, ma ulo-ikwū-ya n'ebe ahu: ọ bu kwa n'ebe ahu ka ndi-orù Aisak gwuru olùlù-miri.
26 Abimelek we si na Gera jekuru ya, ya na Ahuzat, bú eyì-ya na Faikol, bú onye-isi usu-ndi-agha-ya.
27 Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam?
28 Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu;
29 na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.