27 Aisak we si ha, Gini mere unu ji biakutem, ebe unu onwe-unu nākpọm asì, we si n'ebe unu nọ zilagam?
28 Ha si, Ayi ahuwo nke-ọma na Jehova nọyere gi: ayi we si, Biko, ka iṅu-iyi di n'etiti ayi, bú n'etiti ayi na gi, ka ayi na gi b͕a kwa ndu;
29 na i gaghi-eme ayi ihe ọjọ ma-ọli dika ayi nēmetughi gi aka na dika ayi meworo gi nání ezi ihe, ayi we zilaga gi n'udo: ub͕u a gi onwe-gi bu onye agọziri agọzi nke Jehova.
30 Ọ we mere ha oké oriri, ha rie ṅu kwa.
31 Ha bilie n'isi-ututu, ṅuritara onwe-ha iyi: Aisak we zilaga ha, ha si n'ebe ọ nọ la n'udo.
32 O rue n'ubọchi ahu, na ndi-orù Aisak biara, kọrọ ya akukọ bayere olùlù-miri ahu nke ha gwuru, si ya Ayi achọtawo miri.
33 Ọ kpọ ya Shiba: n'ihi nka aha obobo ahu bu Bia-sheba rue ta.