10 i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.
11 Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji.
12 Eleghi anya nnam gēbitum aka, m'agādi kwa ka onye nākwa emò n'anya-ya; m'gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi.
13 Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n'olum, je chitaram ha.
14 Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya.
15 Rebeka we chiri uwe di oké ọnu-ahia nke Isọ, bú nwa-ya nke-okenye nke di n'aka-ya n'ulo, ọ we yibe Jekob, bú nwa-ya nke-ntà:
16 ọ chiri kwa akpukpọ umu-ewu ahu yibe ya n'aka-ya abua na n'olu-ya ebe aji nādigh: