8 Ma ub͕u a, nwam, ge nti n'olum, dika ihe nke mu onwem nēnye gi n'iwu si di.
9 Biko, je ebe ìgwè ewu na aturu di, si n'ebe ahu chitaram umu-ewu abua di nma; m'gēwere kwa ha siere nna-gi nri utọ, dika nke ọ huru n'anya:
10 i gēbuga-kwa-ra nna-gi, ka ọ we rie, ka ọ we gọzie gi tutu ọnwu-ya.
11 Jekob we si Rebeka nne-ya, Le, Isọ nwannem bu nwoke b͕ara aji, ma mu onwem bu nwoke nāb͕aghi aji.
12 Eleghi anya nnam gēbitum aka, m'agādi kwa ka onye nākwa emò n'anya-ya; m'gēme kwa ka nkọcha biakwasim, ọ bughi kwa ngọzi.
13 Nne-ya we si ya, Ya dikwasim, bú nkọcha-gi, nwam: nání ge nti n'olum, je chitaram ha.
14 Ọ je, chita, butere nne-ya: nne-ya we sie nri utọ, dika nke nna-ya huru n'anya.