4 Jekob we zìe kpọ Rechel na Lia bia n'ọhia rue ebe ìgwè ewu na aturu-ya di,
5 ọ si ha, Mu onwem nāhu iru nna-unu, na ọ dighi n'ebe m'nọ dika ọ di na mb͕e gara aga; ma Chineke nke nnam anọyeworom.
6 Unu onwe-unu makwara na ewerewom ikem nile fè nna-unu.
7 Ma nna-unu akwawom emò, we b͕anwe ugwọ-olum ub͕ò iri; ma Chineke ekweghi ya mejọm.
8 Ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi turu agwa gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu turu agwa: ma ọ buru na otú a ka ọ nāsi, Ndi dere ọcha gābu ugwọ-ọlu-gi; ìgwè ewu na aturu nile we nāmu umu dere ọcha.
9 Chineke we napu anu-ulo nna-unu, nyem.
10 O rue, na mb͕e ìgwè ewu na aturu turu ime, na ewelirim anyam abua, hu nime nrọ, ma, le, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika.