2 Ọ we do ndinyom ahu nēje ozi na umu-ha mbu, na Lia na umu-ya n'azu ha, na Rechel na Josef n'azu ha.
3 Ya onwe-ya we gabiga n'iru ha, kpọ isi ala ub͕ò asa, rue mb͕e ọ biaruru nwa-nne-ya nso.
4 Isọ we b͕a ọsọ izute ya, b͕akua ya, dakwasi ya n'olu, sutu ya ọnu: ha we kwa ákwá.
5 Ọ welie anya-ya abua, hu ndinyom na umu-ha; ọ si, Òle ndi bu ndia gi na ha yikọro? Ọ si, Umu nke Chineke nyeworo orù-gi n'amara.
6 Ndinyom ahu ndi nēje ozi we biarue nso, ha onwe-ha na umu-ha, ha kpọ isi ala.
7 Lia na umu-ya biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala: emesia Josef na Rechel biaru-kwa-ra nso, kpọ isi ala.
8 Ọ si, Ọmuma-ulo-ikwū nka nile nke m'zutere, ọ̀ bu gini n'ebe i nọ? Ọ si, Ihuta amara n'iru onye-nwem.