13 Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,
14 ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi:
15 ọ bu nání ma asi na unu eme nka ka ayi gēkwere unu: ọ buru na unu gādi ka ayi, ka ebìe nwoke ọ bula n'etiti unu úgwù;
16 ayi gēnye kwa unu umu-ayi ndinyom, ọ bu kwa umu-unu ndinyom ka ayi gēkuru n'onwe-ayi, ayi na unu gēbi kwa, ghọ otù ndi.
17 Ma ọ buru na unu agaghi-ege ayi nti, ka ebìe unu úgwù; ayi gēkuru kwa nwa-ayi nwayi, la.
18 Okwu-ha nile we di nma n'anya Hemoa, na n'anya Shekem, bú nwa Hemoa.
19 Okorọbia ahu alaghi kwa azu ime ihe ahu, n'ihi na ihe nwa-nwayi Jekob tọrọ ya utọ: ya onwe-ya nwekwara nsọpuru kari ulo nile nke nna-ya.