8 Hemoa we kpayere ha uka, si, Shekem, bú nwam, nkpuru-obi-ya nāhu nwa-unu nwayi n'anya si-ike: biko, werenu ya nye ya na nwunye.
9 Ka ayi na unu nālurita kwa nwunye; nyenu ayi umu-unu ndinyom, kurukwanu umu-ayi ndinyom n'onwe-unu.
10 Ayi na unu gēbi kwa: ala nka gādi n'iru unu; birinu nāzukwanu ahia nime ya, nwe-kwa-nu ihe-onwunwe nime ya.
11 Shekem we si nna Daina, ọ si kwa umu-nne-ya, Ka m'huta amara n'iru unu, ihe unu gāsikwam m'gēnye.
12 Me ka ọ ba uba nke-uku n'isim, bú ego-ilu-nwunye na onyinye, m'gēnye dika unu gāsim, ma nyenum nwa-ab͕ọghọ ahu na nwunye.
13 Umu-ndikom Jekob we were aghughọ za Shekem na Hemoa nna-ya, we kwue, n'ihi na ọ meruru Daina nwa-nne-ha,
14 ha we si ha, Ayi apughi ime ihe a, iwere nwa-nne-ayi nwayi nye nwoke nke anēbighi úgwù; n'ihi na ihe-ita-uta ka ọ buru ayi: