1 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ (nke ahu bu Edom).
2 Isọ luru ndinyom-ya site n'umu-ndinyom Kenean; Eda nwa-nwayi Ilon onye Het, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nnanyi Zibeon onye-Haivait;
3 na Basemat nwa-nwayi Ishmael, nwa-nne-nwayi Nebaiot.
4 Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel;
5 Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n'ala Kenean.
6 Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ.