13 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel; Nahat, na Zera, na Shama, na Miza: ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
14 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, bú nwa-nwayi Zibeon, nwunye Isọ: o we muara Isọ Jeush, na Jalam, na Kora.
15 Ndia bu ndi-isi nke umu Isọ: umu-ndikom Elifaz ọkpara Isọ; Timan onye-isi, Oma onye-isi, Zefo onye-isi, Kenaz onye-isi.
16 Kora onye-isi, Gatam onye-isi, Amalek onye-isi: ndia bu ndi-isi Elifaz n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Eda.
17 Ndia bu kwa umu-ndikom Reuel nwa-nwoke Isọ; Nahat onye-isi, Zera onye-isi, Shama onye-isi, Miza onye-isi: ndia bu ndi-isi Reuel n'ala Edom; ndia bu umu-ndikom Basemat nwunye Isọ.
18 Ndia bu kwa umu-ndikom Ọhọlibama nwunye Isọ; Jeush onye-isi, Jalam onye-isi, Kora onye-isi: ndia bu ndi-isi Ọhọlibama nwa-nwayi Ana, nwunye Isọ.
19 Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom.