19 Ndia bu umu Isọ, ndia bu kwa ndi-isi-ha: nke ahu bu Edom.
20 Ndia bu umu-ndikom Sia onye Hoa, ndi bi n'ala ahu; Lotan, na Shobal, na Zibeon, na Ana,
21 na Dishon, na Iza Dishan: ndia bu ndi-isi ndi Hoa, umu Sia n'ala Edom.
22 Umu-ndikom Lotan bu Hori na Himam; nwanne-nwayi Lotan bu kwa Timna.
23 Ndia bu kwa umu-ndikom Shobal; Alvan, na Manahat, na Ibal, na Shefo, na Onam.
24 Ndia bu kwa umu-ndikom Zibeon; Aia, na Ana: onye ahu bu Ana onye hutara isi-iyi nke miri di ọku n'ọzara, mbe ọ nāzù inyinya-ibu Zibeon, bú nna-ya, nwere.
25 Ndia bu kwa umu-ndikom Ana; Dishon, na Ọhọlibama nwa-nwayi Ana.