4 Eda we muara Isọ Elifaz; Basemat mukwara Reuel;
5 Ọhọlibama mu-kwa-ra Jeush, na Jalam, na Kora: ndia bu umu-ndikom Isọ, nke amuru nye ya n'ala Kenean.
6 Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ.
7 N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha.
8 Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.
9 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia.
10 Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.