6 Ma Isọ chiri ndinyom-ya, na umu-ya ndikom, na umu-ya ndinyom, na madu nile nke ulo-ya, na anu-ulo-ya, na anumanu-ya, na ihe nile ọ nwetara, nke ọ kpatarari n'ala Kenean; ọ we si n'iru Jekob, bú nwa-nne-ya, je ala ọzọ.
7 N'ihi na àkù-ha riri nne kari ibikọ n'otù nke ọnọdu-ọbìa-ha nile apughi kwa inagide ha n'ihi anu-ulo-ha.
8 Isọ we biri n'ugwu Sia: Isọ bu Edom.
9 Ma ndia bu osuso-ọmumu Isọ, nna Edom, n'ugwu Sia.
10 Ndia bu aha umu-ndikom Isọ: Elifaz nwa Eda nwunye Isọ, Reuel nwa Basemat nwunye Isọ.
11 Umu-ndikom Elifaz bu Timan, na Oma, na Zefo, na Gatam, na Kenaz.
12 Timna bukwara Elifaz nwa Isọ iko-nwayi; ọ muara Elifaz Amalek: ndia bu umu-ndikom Eda nwunye Isọ.