21 Reuben we nu ya, naputa ya n'aka-ha, si, Ka ayi ghara itib͕u ya.
22 Reuben we si ha, Unu awusila ọbara; tubànu ya n'olùlù a nke di n'ọzara, ma unu esetila aka imegide ya: ka o we naputa ya n'aka-ha, ime ka ọ laghachikuru nna-ya.
23 O rue, mb͕e Josef biakutere umu-nne-ya, na ha yipuru Josef uwe-ya, bú uwe-nwuda ahu nwere aka nke di n'aru ya;
24 ha kuru ya, tubà ya n'olùlù ahu: ma olùlù ahu tọb͕ọrọ n'efu, miri adighi nime ya.
25 Ha we nọdu iri nri: ha we welie anya-ha, hu, ma, le usu-ije ndi Ishmael si na Gilead nābia, camel-ha nēbu kwa uda na balm na myrrh, nēje iweda ya n'Ijipt.
26 Juda we si umu-nne-ya, Ùrù gini di ya mb͕e ayi gēb͕u nwa-nne-ayi, zo ọbara-ya?
27 Bianu, ka ayi re ya nye ndi Ishmael ndia, aka-ayi adi-kwa-la n'aru ya; n'ihi na nwa-nne-ayi, bú anu-aru-ayi, ka ọ bu. Umu-nne-ya we nu olu-ya.