7 Ọ we jua ndi ahu nējere Fero ozi, ndi nọyere ya n'ebe anēdebe ndi-nkpọrọ n'ulo onye-nwe-ya, si, Gini mere iru-unu ji jọ njọ taa?
8 Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.
9 Onye-isi ndi-obu-ihe-ọṅuṅu ahu we kọrọ Josef nrọ-ya, si ya, Na nrọm, le, osisi vine di n'irum.
10 alaka atọ di kwa n'osisi vine ahu: vine ahu we di ka ọ nāma ifuru, okoko-ya nile b͕ọwara; uyọkọ-ya nile miri nkpuru-vine chara acha:
11 iko Fero di kwa n'akam; m'were nkpuru-vine ahu, pinye ha n'iko Fero, nye iko ahu n'aka Fero.
12 Josef we si ya, Nka bu akukọ-isi-ya: alaka atọ ahu, ubọchi atọ ka ha bu;
13 ọ fọduru ubọchi atọ Fero gēweli isi-gi, me ka i lata n'ọnọdu-gi: i gēnye kwa iko Fero n'aka-ya, dika i nēme na mbu mb͕e i buri obu-ihe-ọṅuṅu-ya.