4 Ọ buru na i nēziga nwa-nne-ayi, ka ayi na ya we yikọ je, ayi gārida, zutakwara gi ihe-oriri:
5 ma ọ buru na i gaghi-eziga ya, ayi agaghi-arida: n'ihi na nwoke ahu siri ayi, Unu agaghi-ahu irum, ma ọ buru na unu na nwa-nne-unu ayikọghi bia.
6 Israel we si, N'ìhi gini ka unu mejọrọm, n'igosi nwoke ahu na unu nwere nwa-nne ọzọ?
7 Ha si, Nwoke ahu jusiri ajuju ike banyere ayi, banyekwara umu-nna-ayi, si, Nna-unu, ọ̀ nọ ndu ub͕u a? ọ̀ di nwa-nne-ọzọ unu nwere? ayi we gosi ya dika okwu ndia si di: àyi gāmara n'ezie na ọ gāsi, Menu ka nwa-nne-unu ridata?
8 Juda we si Israel nna-ya, Ziga nwa-okoro ahu ka mu na ya we yikọ je, ayi gēbili kwa, je; ka ayi we di ndu, ghara inwu, ma ayi, ma gi, ma umu-ntakiri-ayi.
9 Mu onwem gānọrọ ya mbe; n'akam ka i gājuta ya: ọ buru na emeghm ka ọ biakute gi, ọ buru kwa na akpotaghi m ya n'iru gi, emehiewokwam megide gi ubọchi ndum nile:
10 n'ihi na asi na ayi anọghi ọdù, n'ezie ayi gālatawori ub͕ò abua ndia.