6 Ọ we rue ha aru, gwa ha okwu ndia.
7 Ha si ya, N'ìhi gini ka onye-nwem nēkwu okwu dika okwu ndia? Ya buru ndi-orú-gi ihe-árú ime ihe dika ihe a.
8 Le, ego nke ayi hutara n'ọnu akpa-ayi, ayi si n'ala Kenean weghachiri gi ya: àyi gēsi kwa aṅa si n'ulo onye-nwe-gi zuru ọla-ọcha ma-ọbu ọla-edo?
9 Onye ọ bula n'etiti ndi-orù-gi agāchọta ya n'aka-ya, ya nwua, ọzọ kwa, ayi onwe-ayi gāghọrọ onye-nwem ndi-orù.
10 Ọ si, Ub͕u a kwa, dika okwu nile unu si di, otú a ka ọ gādi: onye agāchọta ya n'aka-ya gāburum orù; ma unu onwe-unu gābu ndi puru ya.
11 Ha we me ngwa, weda akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya, ha meghe akpa-ha, onye ọ bula akpa nke ya.
12 Ọ we chọsie ike, n'okenye ka ọ malitere, ọ bu kwa na nke-ntà ka ọ chọbiri: ewe chọta ọkwa ahu n'akpa Benjamin.