24 Ọ we zilaga umu-nne-ya, ha la: ọ si ha, Unu esela okwu n'uzọ.
25 Ha si n'Ijipt rigo, ba n'ala Kenean, biakute Jekob nna-ha.
26 Ha gosi ya, si, Josef nọ ndu ub͕u a, ha gosi kwa ya na ọ bu ya nāchi ala Ijipt nile. Obi-ya we b͕afue, n'ihi na ọ kweghi ha.
27 Ha we gwa ya okwu Josef nile nke ọ gwara ha: mb͕e ọ huru ub͕ọ-ala nile nke Josef ziri ibute ya, mọ nke Jekob, bú nna-ha, we di ndu:
28 Israel we si, O zuwo; Josef, bú nwam, nọ ndu ub͕u a: ka m'je, hu ya anya tutu mu anwua.