2 O we si n'etiti umu-nne-ya nile chiri ndikom ise, guzo ha n'iru Fero.
3 Fero we si umu-nne-ya, Gini bu ọlu unu nālu? Ha si Fero, Ndi-ọzùzù ìgwè ewu na aturu ka ndi-orù-gi bu, ma ayi onwe-ayi, ma nna-ayi-hà.
4 Ha we si Fero, Inọ dika ọbìa n'ala nka ka ayi biaworo; n'ihi na ọ dighi ihe eji azù ìgwè ewu na aturu ahu nke ndi-orù-gi nwere; n'ihi na oké unwu a di arọ́ n'ala Kenean: ub͕u a kwa, biko, ka ndi-orù-gi biri n'ala Goshen.
5 Fero we gwa Josef okwu, si, Nna-gi na umu-nne-gi abiakutewo gi:
6 ala Ijipt, n'iru gi ka ọ di; me ka nna-gi na umu-nne-gi biri n'ebe kachasi nma nke ala nka; ha gēbiri n'ala Goshen: ọ buru kwa na i mara, si, na ndi-dìnkpà dí n'etiti ha, i gēdo kwa ha ndi-isi anu-ulo m'nwere.
7 Josef we me ka Jekob nna-ya bata, o guzo ya n'iru Fero: Jekob we gọzie Fero.
8 Fero we si Jekob, Ùbọchi arọ ndu-gi di ole?