1 Jekob we kpọ umu-ya ndikom òkù, si: Chikọtanu onwe-unu, ka m'we gosi unu ihe gādakwasi unu na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia.
2 Zukọnu, nukwanu, umu-ndikom Jekob;Genu nti n'olu Israel, bú nna-unu.
3 Reuben, ọkparam ka i bu, ikem, na nkpuru mbu nke umem;Ọkaka nke nbuli-elu, na ọkaka nke ike.
4 I nāb͕oghari dika miri, akarila akari;N'ihi na i rigoro n'ihe-ndina nna-gi:Mb͕e ahu i mere ya ka ọ ghara idi nsọ: ọ rigoro n'utem.