12 Anya-ya abua nācha ọbara-ọbara site na manya-vine,Ezé-ya nēnwu kwa ọcha site na miri-ara-ehi.
13 Zebulun, n'ọnu-miri nke oké osimiri ka o gēbi:Ya onwe-ya gānọ kwa n'ọnu-miri nke ub͕o.Akuku-ya gādi kwa n'akuku Zaidon.
14 Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15 Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16 Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17 Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.
18 Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova