14 Isaka bu inyinya-ibu di ike,Nāmakpuru n'etiti ogige-aturu abua:
15 Ọ we hu izu-ike, na ọ di nma,Hu kwa ala ahu, na ọ di uto;Ọ we chebe ubu-ya ibu ibu,We ghọ onye nēfè òfùfè orù.
16 Dan gēkpeputa ndi-ya,Dika otù nime ebo nile nke Israel.
17 Ka Dan buru agwọ n'uzọ,Aju-ala n'okporo-uzọ,Nke nāta ikiri-ukwu inyinya aru,Onye o nēbu we daghachi azu.
18 Nzọputa-Gi ka m'cheworo, Jehova
19 Gad, usu ndi nāpunara madu ihe gākpagide ya:Ma ya onwe-ya onwe-ya gākpagide ha n'ikiri-ukwu.
20 Asha ka abuba si aputa, bú nrí-ya,Ya onwe-ya gēnye kwa ihe-utọ di iche iche nke eze.