20 ubọchi nile nke Jered we buru nnù arọ abua na ọgu asatọ na abua: o we nwua.
21 Inok di ndu ọgu arọ atọ na ise, ọ mua Metusela:
22 Inok na Chineke we yikọ nējeghari, mb͕e ọ musiri Metusela, ọgu arọ iri-na-ise, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom:
23 ubọchi nile nke Inok we buru ọgu arọ iri-na-asatọ na arọ ise:
24 Inok na Chineke we yikọ nējeghari: ọ nọghi kwa: n'ihi na Chineke kuru ya la.
25 Metusela di ndu ọgu arọ iteghete na asa, ọ mua Lemek:
26 Metusela di ndu, mb͕e ọ musiri Lemek, nnù arọ na ọgu iri-na-iteghete na arọ abua, ọ mua umu-ndikom na umu-ndinyom: