4 Ubọchi ikwara ya ákwá we gabiga, Josef we gwa ulo Fero okwu, si, Biko, ọ buru na ahutawom amara n'iru unu, biko, kwuenu na nti Fero, si.
5 Nnam merem ka m'ṅua iyi, si, Le, mu onwem gaje inwu: n'ílìm nke m'doziworo onwem n'ala Kenean, n'ebe ahu ka i gēlìm. Ma ugbua, biko, ka m'rigo, lìe nnam, lata.
6 Fero we si, Rigo, lìe nna-gi, otú o mere gi ka i ṅua iyi.
7 Josef we rigo ilì nna-ya: ndi-orù Fero nile, na ndi-okenye ulo-ya, na ndi-okenye nile nke ala Ijipt,
8 na ulo Josef nile, na umu-nne-ya, na ulo nna-ya, we so ya rigo: nání umu-ntakiri-ha, na ìgwè ewu na aturu-ha, na ìgwè ehi-ha, ka ha rapuru n'ala Goshen.
9 Ma ub͕o-ala ma ndi inyinya nēbu we so ya rigo: ọmuma-ulo-ikwū ahu we di oké uku.
10 Ha biarue ebe-nzọcha-ọka nke Atad, nke di n'ofè Jọdan, ha we were iti-aka-n'obi di uku di kwa ike nke-uku ti aka n'obi n'ebe ahu: ọ we mere nna-ya oruru-újú ubọchi asa.