8 Nime anu di ọcha, na nime anu nke nādighi ọcha, na nime anu-ufe na ihe nile ọ bula nke nākpu akpu n'elu ala,
9 abua abua bakuru Noa n'ub͕ọ ahu, oke na nwunye, dika Chineke nyere Noa iwu.
10 O rue, mb͕e ubọchi asa ahu gasiri, na miri nke iju-miri ahu di n'elu uwa.
11 N'arọ nke-nnù-na-ọgu-iri nke ndu Noa, n'ọnwa nke-abua, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa, n'ubọchi ahu ka ab͕awara isi-iyi nile nke oké ob͕u-miri, emeghe-kwa-ra window nile nke elu-igwe.
12 Oké miri-ozuzo ahu we di n'elu uwa ọgu ubọchi abua ehihie na abali.
13 N'otù ubọchi ahu ka Noa, na Shem na Ham na Jefet, bú umu-ndikom Noa, na nwunye Noa, ha na nwunye nile nke umu-ya ndikom, bara n'ub͕ọ ahu;
14 ha onwe-ha, na anu-ọhia nile ọ bula di iche iche, na anu-ulo nile ọ bula di iche iche, na ihe nile ọ bula di iche iche nākpu akpu nke nākpu akpu n'elu uwa, na anu-ufe nile ọ bula di iche iche, aha nnunu nile ọ bula.