1 Ma Chineke chetara Noa, na anu nile di ndu, na anu-ulo nile nke ya na ha nọ n'ub͕ọ; Chineke we me ka ifufe gabiga n'elu uwa, miri we taba;
2 e mechikwara isi-iyi nile nke ob͕u-miri na window nile nke elu-igwe, eb͕ochi-kwa-ra oké miri-ozuzo nēsite n'elu-igwe;
3 miri we si n'elu uwa nālaghachi mb͕e nile: miri ahu we bilata mb͕e ọgu ubọchi asa na iri gwusiri.
4 Ub͕ọ ahu we tọb͕ọrọ n'elu ugwu nke Ararat n'ọnwa nke-asa, n'ubọchi nke-iri-na-asa nke ọnwa ahu.