15 M'we cheta ọb͕ub͕a-ndum, nke di n'etiti mu na unu na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile; miri agaghi-aghọ kwa iju-miri ọzọ ibibi anu-aru nile.
16 Eke-na-ogwurugwu ahu gādi kwa n'igwe-oji; M'gāhu kwa ya anya, icheta ọb͕ub͕a-ndu ebighi-ebi di n'etiti Chineke na anu nile ọ bula nwere nkpuru-obi di ndu nime anu-aru nile nke di n'elu uwa.
17 Chineke we si Noa, Nka bu ihe-iriba-ama nke ọbub͕a-ndu ahu nke M'meworo ka o guzosie ike n'etiti Mu na anu-aru nile nke di n'elu uwa.
18 Umu-ndikom Noa, ndi siri n'ub͕ọ ahu pua, bu Shem, na Ham, na Jefet: ma Ham bu nna Kenean.
19 Ndia atọ bu umu-ndikom Noa: ọ bu kwa site na ndia ka uwa nile b͕asara.
20 Noa, bú onye-ọlu-ubi, we malite iku ubi-vine:
21 ọ we ṅua ufọdu nime manya-vine-ya, ṅubiga ókè, b͕aba onwe-ya ọtọ n'etiti ulo-ikwū-ya.