10 Lot we welie anya-ya abua, hu Gburugburu-ala nile nke Jọdan, na ala ahu nile bu ala miri nēdè nke-ọma, tupu Jehova ebibie Sọdọm na Gọmọra, dika ubi Jehova ab͕ara ogige, dika ala Ijipt, mb͕e i nēje Zoa.
11 Lot we rọputara onwe-ya Gburugburu-ala nile nke Jọdan; Lot we bulie ije je n'Iru-anyanwu: ha we kewapu onwe-ha otù n'aru nwa-nne-ya.
12 Abram biri n'ala kenean, ma Lot biri n'obodo nke Buruburu-ala ahu, ropu ulo-ikwū-ya je rue Sọdọm.
13 Ma ndi Sọdọm bu ndi ọjọ na ndi-nmehie megide Jehova nke-uku.
14 Ma Jehova siri Abram, mb͕e Lot kewapusiri onwe-ya n'ebe ọ nọ, Biko, welie anya-gi abua, si n'ọnọdu a, ebe gi onwe-gi nọ, le anya n'Ugwu na na Ndida na n'Iru-anyanwu na n'Ọdida-anyanwu:
15 n'ihi na ala nka nile nke gi onwe-gi nāhu anya, gi ka M'gēnye ya, nye kwa nkpuru-gi rue mb͕e ebighi-ebi.
16 M'gēme kwa ka nkpuru-gi di ka ájá nke ala: ya bu na, ọ buru na madu puru iguta ájá nke ala, agāguta kwa nkpuru-gi.