16 Nwa-ab͕ọghọ ahu di nma nke-uku ile anya, nwayi nke akāmaghi nwoke, nwoke amaghi kwa aru-ya: ọ rida n'isi-iyi ahu, b͕ajue ite-ya, rigota.
17 Orù ahu we b͕a ọsọ izute ya, si, Biko, kwe ka m'ṅua nwantī miri site n'ite-gi.
18 Ọ si, Nua, onye-nwem: ọ me ngwa, zie ite-ya n'aka-ya, me ka ọ ṅua.
19 Mb͕e ọ mesiri ka ọ ṅua, nwayi ahu siri, Kamel gi ka m'gēsere kwa miri, rue mb͕e ha gāṅujuwori.
20 Ọ me ngwa, b͕apu miri di n'ite-ya nime ihe anu-ulo ji aṅu miri, ọ b͕a ọsọ ọzọ rue olùlù-miri isere miri, we sere nye camel-ya nile.
21 Nwoke ahu nēlegide ya anya, nāb͕a nkiti, imara ma Jehova mereri ka ije-ya ga nke-ọma, ma-ọbu na O meghi.
22 O rue, mb͕e camel ṅujusiri miri, na nwoke ahu were nb͕a-aka ọla-edo, nke ọtùtù-ya bu nkera shekel, na ọla-aka abua ib͕a n'aka-ya abua nke ọtùtù-ha bu shekel ọla-edo iri;