33 Ezi omumem gāza-kwa-ram n'ọdi-n'iru, mb͕e i gābia bayere ugwọ-ọlum nke di n'iru gi: nke ọ bula nke nātughi agwa na ntupọ n'etiti ewu, nkem nke nādighi kwa nji n'etiti aturu nkem, ihe ezuru ori ka nke ahu bu n'akam.
34 Leban we si, Le, biko, ya di ka okwu-gi si di.
35 O we wezuga n'ubọchi ahu nkpi nile dere ọcha na nke turu ntupọ, na nne-ewu nile turu agwa na ntupọ, nke ọ bula nke nwere ọcha nime ya, na nke ọ bula di nji n'etiti aturu, o nye ha n'aka umu-ya ndikom;
36 o je ije nke ubọchi atọ n'etiti ya na Jekob: ma Jekob nāzù ìgwè ewu na aturu Leban fọduru.
37 Jekob we chiri n'onwe-ya nkpa-n'aka nke osisi poplar di ndu, na nke osisi almond, na nke osisi plane; o kpechaputa ebe di ọcha nime ha, nēme ka ọcha nke di nime nkpa-n'aka ahu puta ìhè.
38 O we guzo nkpa-n'aka ahu nke o kpere na ncherita-iru ìgwè ewu na aturu n'ebe anētiye miri n'ihe anu-ulo ji aṅu miri, ebe ìgwè ewu na aturu nābia iṅu miri; ha we turu ime mb͕e ha biara iṅu miri.
39 Ìgwè ewu na aturu ahu we turu ime n'iru nkpa-n'aka ahu, ìgwè ewu na aturu ahu we mua umu dere ọcha, na nke turu agwa, na nke turu ntupọ.