11 Mọ-ozi nke Chineke we sim nime nrọ ahu, Jekob; m'we si, Lekwam.
12 Ọ si, Biko, welie anya-gi abua, hu, nkpi nile nke nāb͕a ìgwè ewu dere ọcha, tu kwa agwa, tu kwa akika: n'ihi na ahuwom ihe nile Leban nēme gi.
13 Mu onwem bu Chineke nke Betel, ebe i tere ogidi manu, ebe i kwerem nkwa: ub͕u a bilie, si n'ala nka pua, laghachi n'ala nke ọmumu-gi.
14 Rechel na Lia we za, si ya, Ọ̀ di òkè ma-ọbu ihe-nketa ayi nwere n'ulo nna-ayi ọzọ?
15 Ọ̀ bughi na ndi ala ọzọ ka ọ guworo ayi? n'ihi na ọ rewo ayi, ripiasia kwa ego-ayi.
16 N'ihi na àkù nile nke Chineke napuworo nna-ayi, ọ bu ayi na umu-ayi nwe nke ahu: ub͕u a kwa, ihe ọ bula Chineke siri gi, me ya.
17 Jekob we bilie, palie umu-ya ndikom na ndinyom-ya dọkwasi ha n'elu camel-ya;