3 Ọ we turu ime, mua nwa-nwoke; Juda we kpọ aha-ya Ia.
4 Ọ we turu ime ọzọ, mua nwa-nwoke, kpọ aha-ya Onan.
5 Ọ we mu kwa nwa-nwoke ọzọ, kpọ aha-ya Shila: ma Juda nọ na Kezib mb͕e ọ muru ya.
6 Juda we lutara Ia ọkpara-ya nwunye, nke aha-ya bu Tema.
7 Ma Ia, bú ọkpara Juda, jorọ njọ n'anya Jehova, Jehova we me ka ọ nwua.
8 Juda we si Onan, Bakuru nwunye nwa-nne-gi, we luara ya ọlu nwa-nne di, me ka nkpuru tolitere nwa-nne-gi.
9 Ma Onan mara na ọ bughi ya gēnwe nkpuru ahu; o we rue, na mb͕e ọ bula ọ bakuru nwunye nwa-nne-ya, na ọ wusiri ya n'ala, ka ọ we ghara inye nwa-nne-ya nkpuru.