16 Ken we si n'iru Jehova pua, biri n'ala Nod, n'Iru-anyanwu Iden.
17 Ken we mara aru nwunye-ya; ọ we turu ime, mua Inok: ma Ken nọ nēwu obodo, o we kpọ aha obodo ahu, dika aha nwa-ya nwoke si di, Inok.
18 Ewe mua Irad nye Inok: Irad we mua Mehujael: Mehujael we mua Metushael: Metushael we mua Lemek.
19 Lemek we lutara onwe-ya ndinyom abua: aha otù onye nime ha bu Eda, aha nwayi ibe-ya bu Zila.
20 Eda we mua Jebel: onye ahu bu nna ndi bi n'ulo-ikwū, ndi nwe-kwa-ra anu-ulo.
21 Aha nwa-nne-ya nwoke bu Jubal: onye ahu bu nna ndi nile nākpọ ubọ-akwara, nēb͕u kwa ọ̀jà.
22 Zila kwa, nwayi ahu mu-kwa-ra Tubal-ken, onye nākpu ihe-ọlu nile ọ bula nke ọla na nke ígwè: ma nwa-nne-nwayi Tubal-ken bu Neama.